EKERESIMESI ELUTEGO by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Christmas Celebrations Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ekeresimesi elutego, Lekwanụ Ekeresimesi o! Ekeresimesi elutego eh! O lutego! Ekeresimesi elutego. Ị ma n'o lutego! K'anyị ṅụrịa ṅụọ o n'o lutego! K'anyị ṅụrịanụ na Kristi, Nwa Chineke abịago. Ekeresimesi elutego eh! O lutego! Jekenenụ but'ịgba n'egwu ọma n'ogene nke characha! Kụa mgbịrịgba eh! Kụa mgbịrịgba eh! Doo biko kụa mgbịrịgba eh! Nwa Chineke abịago. Kụa mgbịrịgba eh! Ekeresimesi abịago! Kụa mgbịrịgba eh! Kụa mgbịrịgba eh! Doo biko kụa mgbịrịgba eh! Nwa Chineke abịago. Kụa mgbịrịgba eh! Ekeresimesi elutego! VERSE 1 Jesu Nwa Chineke, amụrụ Ya n'ụl'anụ, n'ikpo ahịhịa k'amụrụ Ya. Meri nne Ya gbobe Y'akwa, wee nibe Ya n'agbụke. VERSE 2 Ndị nche atụrụ nọ n'ime ọhịa n'etiti abalị. Ha n'eche atụrụ ha, atụrụ ha n'akpa nri. Na ntumade, Mmụọzi nke Chukwu bịakwutere ha, ebube ya zuru h'ahụ! VERSE 3 Nnukwu egwu jidere ha, obi nmapụ jidere ha. Mmụọzi gwara ha sị ha, "Unu atụl'egwu! N'obodo Devid, taa, amụtaal'unu Onye nzọpụta, Kristi, Dinwenu!" VERSE 4 Ndị eze atọ si n'ọwụw'anyanwụ bịa. Ha n'achọ Eze amụrụ ọhụrụ. Kpakpando wee pụta n'ụdị pụr'iche wee duruo ha n'eb'e nibere Ya.

Download the sheet music

EKERESIMESI ELUTEGO

EKERESIMESI ELUTEGO

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
10 pages
9 Downloads
Christmas Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want