Full Lyrics
CHORUS
Ekene O! Ekene O! Ekene diri Chukwu O!
Chai! Odogwu akataaka n'I bụ Onye mmeri!
bụ na ngozi Gị n'ebe m nọ erika
Ọmama masịamasị!
Amara Gị n'ebe m nọ bara ụba.
O! Ekene diri Chukwu.
VERSE 1
Ihe m ji n'eto Gị, Chineke m o, Ome mma.
Ihe m ji aja Gị mma, Ọka k'igwe, Chi mar'obi m o,
bụ na ngozi Gị n'ebe m nọ erika
Ọmama masịamasị!
Amara Gị n'ebe m nọ bara ụba.
O! Ekene diri Chukwu.
VERSE 2
N'okporo ụzọ niile, I n'edu m o, I n'azọ m o.
M fee n'elu, m gaa n'ala
m gbaa n'etititi mmiri.
Ngozi Gị, Chineke m o n'ahụ m o,
O n'echekwaba m o.
Amara Gị, Chineke, ka m ji aga.
O! Ekene diri Chukwu.
VERSE 3
Nwa bụ onyinye Chukwu
Nwa bụ onyinye mara mma.
Nwa nwoke, nwa nwanyị,
bụ ngozi Chukwu si n'igwe
Nwa kọ na m o!
Nna!
A gada gbachir'ụzọ nụrụ nụ o!
O mụnụ akọna m o!
I kemkwoaba!
O Ekene diri Chukwu.