Full Lyrics
REFRAIN
Dube m'o, Chineke dube mo,
N'ihina agbaba wom n'ime gi.
Ebe m nwere Eze Jesus,
M gagh atu egwu uzo?
Nkume mgbe ebi gh'ebi,
Kwe ka m zoro n'ime gi.
VERSE 1
Gi siri mu atulegwu, n'ihina gi nonyere mo.
Gi siri m'atulegwu, elelanya buru buru n'ujo.
N'ihina gi onwe gi bu Chineke m'o.
I g'agba m'ume, wer'aka nri gi kwagide mu, nna ka m ghari da.
VERSE 2
N'ime okwukwe ka Moses jiri kporu umu Israel laa,
Pharaoh dara n'ime ya, ndi agha ya gburu n'ime ya.
Site n'okwukwe ka Naomi jiri weta ngozi duju ya,
Wer'okwukwe leta ndi gi nna k'anyi we guzosie ike.
VERSE 3
Ewezugara ugwu no nodu ya,
Chineke m, mu anya.
Ekwensu na waghari mgbe nile,
Chineke m, mu anya.
Were ike nso gi kwagide mu nna,
Ka m ghari da.
CODA
Dube mo, Chineke dube mo,
N'ihina agbaba wom n'ime gi dube mo, Chineke.
M'ihina agbaba wom n'ime gi dube mo.
Ebe m nwere Eze Jesus, m gagh atu egwu ozo.
Nkume mgbe ebi gh'ebi, kwe ka m zoro n'ime gi.