Full Lyrics
REFRAIN
So Ngi bu Onyem nwere. Chineke Nna
lezie nwa Gi anya.
Chukwu m'ekwela k'uwa merie mo.
VERSE 1
Abum onye nmehie nke dara mba n'olu,
were Muo Nso Gi kpalite obi mo.
VERSE 2
Cheta na oyi omuma nk'uwa n'amalili,
Chukwu merir'onwu na ekwensu, bia.
VERSE 3
Chetakwa n'ebili mmiri nk'uwa ka n'etilili,
Chukwu dajulu ebili mmiri o, bia.
VERSE 4
Anyi no n'agha n'el'uwa Chineke,
Chukwu m'ekwela k'uwa merie mo.
VERSE 5
A bum nwa Gi Chineke, chebe mo,
bik'ekwela k'uwa merie mo.
VERSE 6
So Ngi bu Chukwu okike, ndu m di Gi n'aka,
I gbarapu mo, o gini kam g'eme?