Full Lyrics
REFRAIN
Ngwanụ k'anyị jenu nara Kristi n'oriri nsọ.
Ngwanụ k'anyị jenu nara Dinwenu n'oriri nsọ.
Nri ọma k'anyị g'eri. Nri ọma si n'igwe.
Nri ndị nmụọzi akwadebeere ndị ọma k'anyị g'eri. Bịanụ ra Ya.
K'anyị jeenụ rie. Ezi nwanne k'anyị jeenụ nara.
Ahụ Dinwenu n'enye ndụ n'ezie, bịa nara Ya!
Ndị dị nma n'obi bịa.
Ndị dị ọcha n'obi bịa kene.
Ndị obi ebere bịa nara Dinwenu n'oriri nsọ.
VERSE 1
Ngwanụ k'anyị jeenụ sọpụrụ Onye nwụr'ọnwụ n'elu obe.
Ngwanụ k'anyị jeenụ sekpuere Onye chụr'aja n'elu obe.
Ngwanụ k'anyị jeenụ kpooro Y'isi ala n'oziere Ya!
Ngwanụ k'anyị jeenụ nara Jesu nọ n'oriri Nsọ.
VERSE 2
Ọ bụ onye g'akọwara m ihe omimi?
Ọ bụ ihe omimi!
Ihe d'ịtụnanya! Ị g'akọwa ya? Ihe omimi!
Ọ bụ onye g'akọwara m ihe omimi?
Ọ bụ ihe dị ebube.
Ihe d'ịtụnanya! Ị g'akọwa ya? Ihe omimi!
N'ezie ih'ịtụnanya n'anya mmadụ,
na Chukwu wer'Onwe Ya nye maka mụ na gị,
nwụ ọnwụ n'elu obe maka njọ mụ na gị.
Ọ gbanwor'onwe Ya were nye anyị sị anyị rie,
sị anyị nụa, n'ụdị achịcha na mmanya.