NARANU M RIE by JUDE NNAM — Lyrics

JUDE NNAM Igbo Communion Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ụmụ Chineke, naranụ m rie nụ, Naranụ m rie nri dị nsọ nri ọma. Naranụ m ṅụọ Ọbara m o. Nri n'enye ndụ, ndụ ebighị ebi. Nri ndị Mmụọzi, naranụ m rie nri dị nsọ nri ọma. Naranụ m ṅụọ Ọbara m o. Nri si n'igwe gbadata Ọ bụ Kristi n'akpọ gị, bia. Nwanne m, bia, Naranụ m rie nri dị nsọ nri ọma. Naranụ m ṅụọ Ọbara m o. Nri n'enyenw'anyị n'akpọ gị. "Naranụ m rie, nke a bụ Ahụ m o. Naranụ m ṅụọ, nke a bụ Ọbara m o." Nri dị nsọ nri ọma. Naranụ m ṅụọ Ọbara m o. Nwanne m, bia rie nri si n'igwe gbadata. Iko ngọzi, Ọbara Dinwenu. Naranụ m ṅụọ Ọbara m o. VERSE 1 Chukwu Nwa si n'eligwe bia n'ụwa. O Jesu Kristi. Ọ tara ahụhụ, Ọ nwụrụ ọnwụ n'ihi mụ na gị. Tupu Ọ lakwuru Nna Ya. Jesu mer'onwe Ya, Achịcha nke ndụ. Achịcha si n'igwe. Nri n'enye aṅụrị ebighị ebi. VERSE 2 Ọbara m bụ ihe ọṅụṅụ. Nke a bụ okwu nke Dinwenu. Eh! nụrụ okwu nke Dinwenu. Ony'ọbụla, Ony'ọbụla, Ony'ọbụla nke rir'Ahụ m, Ony'ọbụla, Ony'ọbụla, Ony'ọbụla nke ṅụr'Ọbara m, G'enwe ndụ n'ezie, ebighị ebi. VERSE 3 Oge nna nn'anyị ha nọ n'ọzara, Chukwu nyere ha achịcha si n'igwe, n'ụdị manna. Man'ugbua, n'oge nke anyị, Chukwu nyer'anyị Nwa Ya, Jesu Kristi, Achịcha dị ndụ. Jesu, Onye nzọpụta. Jesu, Nwatụrụ e jiri chụọ aja. Jesu, Onye kpọchapụrụ njọ mụ na gị! Jesu, Achịcha dị Nsọ.

Download the sheet music

NARANU M RIE

NARANU M RIE

By JUDE NNAM
Staff & Solfa
Igbo
14 pages
10 Downloads
Communion Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want