JESU KRISTI BỤ IHE NKE ỤWA NIILE by Chris N. Ogu — Lyrics

Chris N. Ogu Igbo Communion Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Jesu Kristi bụ ihe nke ụwa niile, Ọ bụ ihe, Jesu Kristi bụ ihe nke ụwa niile, Okwu e mer'ahụ na isi Nzukọ, sọ Gị bụ eziokwu nke anyị gaeso, anyị gaeso ruo na ndụ. VERSE 1 Dịbụ tupu e kee ụwa, site na Gị ka e siri kee ihe niile, n'aka Gị ka ndụ dị, bụ ihe mba niile. Ndụ ahụ bụ ihe mba niile. VERSE 2 Gị bụ amaala mba niile, Gị bụ ọdịnaala naerute na ndụ, ndị niile nabatara Gị dọọrọla nke ndụ. VERSE 3 Gị, I nyere ike, ike, I nyere ike ịbụ ụmụ Chineke. Mee k'anyị hụ ebube Gị, mara ikwụb'aka'ọtọ Gị, nye any'ịhụnanya na'udo k'anyị keta'oke ngọzi Gị. VERSE 4 Ka ire niile kwupụta Gị, O Kristi, Onye nwe anyị na onye nzọpụta, ka mba niile site na Gị nye Chineke Nna, Nna na Mmụọ Nsọ, otito, otito, otito, otito.

Download the sheet music

JESU KRISTI BỤ IHE NKE ỤWA NIILE

JESU KRISTI BỤ IHE NKE ỤWA NIILE

By Chris N. Ogu
Solfa
Igbo
4 pages
3 Downloads
Communion Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want