Full Lyrics
CHORUS
Kunie gaa naranụ Jesu nọ na Yukaristia;
Kunie naranụ Jesu nọ na Yukaristia.
Mara ya na Onye riri ya g'enwe ndụ ọkpu,
na Onye ṅụrụ ya g'enwe ndụ ọkpu,
Ndụ ebighiebi.
VERSE 1
Oriri Nsọ n'enye ndụ ebighiebi O,
maka n'onye riri ahụ Nwa nke Chukwu,
gadị ndụ ọkpu, gaghị anwụọ O.
VERSE 2
Ka'nyị jeenụ rie ahụ n'ọbara Ya O,
Mana tupu I rie ṅụọ ahụ n'ọbara Kristi;
nyocha obi gị ka I hụ n'ị dịgcha ọcha
tupu I nara Ya O.
VERSE 3
Chukwu Nwa nyenụ anyị amara Gị O,
amara I ji nata ahụ n'Ọbara Gị;
K'anyị wee banye n'ala eze Eligwe,
Site n'Oriri Nsọ O.