AGA M EJE N'ALTAR by JUDE NNAM — Lyrics

JUDE NNAM Igbo Communion Hymns Eucharistic songs Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Aga m eje na r'ahu Kristi. Aga m eje n'altar, na r'ahu Kristi. Ahu Dinwenu Jesu Kristi, I n'enye ndu o! Ahu Dinwenu Jesu Kristi n'I di uto. Nri oma. VERSE 1 Kristi kwuru si, 'Abu m achicha ndu. Abu m achicha ndu nke si n'eligwe bia n'uwa. Ony'obula riri ya bu achicha g'enwe ndu ebigh'ebi. Ony'obula riri ya bu achicha g'adi ndu okpu'. Nri oma. Kristi n'akpo m'oku n'aga m aza! VERSE 2 Dinwenu kwuru si, 'Abu M Ndu. Abu M Mbilite n'onwu. Abu M Ndu. Ony'obula kwere na M, o gagh'anwu anwu. Oburu n'onwur'anwu, o g'adi ndu ozo'. Nri oma. Kristi n'akpo m'oku n'aga m aza! VERSE 3 'Oburu na unu erighi Ahu mo, Oburu na unu anugh'Obara mo, unu am'enwenata ndu n'im'unu'. Okwu Jesu, Achicha si n'igwe. Nri oma. Kristi n'akpo m'oku n'aga m aza!

Download the sheet music

AGA M EJE N'ALTAR

AGA M EJE N'ALTAR

By JUDE NNAM
Staff & Solfa
Igbo
3 pages
21 Downloads
Communion Hymns Eucharistic songs Hymns
1 0

More lyrics you may want