Full Lyrics
CHORUS
Chukwu dum eje, ezi Chukwu ka m si aga.
Ọ bụ Chukwu n'enye m onyinye mara mma,
n'ihi nke a a ga m enye ya ekele.
Ọ bụ Chukwu n'enye m onyinye mara mma,
n'ihi nke a a ga m enye ya ekele.
VERSE 1
Akụnụba niile si n'aka Chukwu.
Ngozi niile ọ bụ Chukwu n'enye ya.
Ụmụnne m k'anyị kelee nụ Olisa,
n'ihi na o meere anyị ihe ọma.
VERSE 2
Akọnuche bụ Chukwu nyere mmadụ.
Ịtụ egwu Chukwu bụ mbido amamihe.
Ụmụ ibe m soro mu bịa kelee ya,
n'ihi na o meere anyị ihe ọma.