Full Lyrics
[REFRAIN]
Chizitere mo ihe mmad'uwa woro mo
Akwa mgbochi e tiwara shim tere m'egwu m egwu oma
Abum onye na Chukwu n'echerem echiche oma eh
ebe mkpofu ntu k'ochetaram bia mem nwogbenye ezege
Um'uwa wee juba m si ob' agha k'osi mee
ya ihe m ma bu chim hurum n'anya ih'ebub'e mela
Ih'ebub'e mela k'anyi tobe ya ih'ebub'e mela
Ih'ebub'e mela k'anyi tobe ya ih'ebub'e mela
Ih'ebub'e mela k'anyi tobe ya
onye mmeri ewo Chukwu nkemo onye kwur'okwu na Jerusalem yaga
mezue na Capernaum uwa were tibe uwa were kpoba mkpu n'ok'olu tio lo lo lo
bia ribe Nnam ohela eh mkpu onu na fiokwa ebe nine ndi ekwe ekwe n'e
kelebe chi oge chi kam ma tobenu Chukwu nna toben
lo o lo lo lo lo o lo lo lo lo Chi
kwe n'ute kwere o tio lo lo lo lo o lo lo lo lo Chi
na Uchenna g'eme Tobe nu Chinekelebe chi oge Chi kam
ziterem ihe oma
ziterem ihe oma
ziterem ihe oma
m'o ziterem ihe oma
[VERSE 1]
Akuko maka ngozi Chukwu a gam akao ya k'osi me
Nkoro ya Dimo Nkoro ya Nwuyem Nkokwara y'umu umu mo
Umu umu m g'akoro ya gaba ndudugandu nile.
Obidoro kemgb' ebum n'afo okweghi nd' iro m hum anya,
mgb'amurum, e kurum, egberem igbe ma gbakw'oso ma m emelughi ahu
site na nwatam rue n'okenyem eh, afo oma y'enweghi nkocha
Chizitere m ihe oma
Ih' ebub' e mela
[VERSE 2]
Ara guba nwa obere nne akwa nne nukwa akwa nwa onye nw' ara.
Akwa nderi m kwara ka Chukwu gechara mee mu mma,
Uwa lekwanu muo agam esi agha kele,
abu otito na ihe onyinye di mma kam buru butere Chukwu ewo
Chizitere m ihe oma
Ih' ebub' e mela
[VERSE 3]
Chim huru m n'anya O n'enyem ihem yoro ya n'aka
onyenu mmad'uwa ka onyenu mo imara shi nkem ekpomekwe
tukwasi obi gi na Chukwu og'enye gi ihe I yoro ya
oburu nwa o g'ewere nye gi ya
oburu di o g'ewere nye gi ya
oburu ego o g'ewere gi ya tuo ya
ite ako mmanu Chim le
Ite ako mmanu Chiboke
Ite ako mmanu ode jim jim
chiri gaba Ochendo ko mmanu ko mmanu do ko mmanu
[SOLO]
Ima, ihe awor'ogoli zuo n'ahia O na eri kw'onu
kedu kam g'esi ken'Olisa na Ngozi ya nile mgam akocha?
m si kam kwuba, Agam akwucha y'ugwo?
O nwa nnem soro mo k'anyi tuoro ya mma mma
ony' omere mma bia soro mo k'anyi tuoro ya mma mma
Onyere gi onu bia soro mo k'anyi tuoro ya mma mma
oborochi soro mo k'anyi tuoro ya mma mma.
Ndi onyer' ego bia soro mo k'anyi tuoro ya mma mma.
Ndi onyere nwa bia soro mo k'anyi tuoro ya mma mma.
Chiziterem ihe oma Ih'ebube emela