Full Lyrics
[REFRAIN]
Ọ nemere m nma, Ọ nemere m nma nma;
Kedu ihe m gaenye ya, Chinemere m nma nma,
Kedu ihe m gaenye Nna m o, Ony' obi ọma.
A ga m aja ya nma,
A ga m atụrụ ya nma nma,
Chinemere m o,
Ọnụ m apụghị ịkọchasi
Chinemere m nma n'eziokwu.
[VERSE 1]
Ị naajụ m onye nyere m ndụ m o,
Ị n'abata n'ụwa ị hụ ọnwa,
Onye nyere gị ndụ n'eziokwu.
Chinemere m o,
Chinemere m ihoma,
Nwanne m so m kele Chineke Nna bụ ya bụ Chinemere m ihoma.
[VERSE 2]
Ị naajụ m onye nyere m ahụike,
Onye n'echebe gị n'ihe nile.
Chinemere m o,
Chinemere m ihoma,
Nwanne m so m kele Chineke Nna bụ ya bụ Chinemere m ihoma.