Full Lyrics
INTRO
Mgbe nile m nakwado ịbịa tuoro Gị nma nma.
Ma mgbe nile m nọgbu ụwa nọda chikarịa, bịa tuoro Gị nma nma.
Mana Chukwu mo Eh! O mezugo tata, bịa tuoro Gị nma nma.
Chinecherem mo bịa ukwe kam ji bịa n'iru Gị
Chinecherem mo bịa tuoro Gị nma nma.
CHORUS
Bịanụ nara ekele bịanụ nara otito Chineke gwụna nkwa kam ji bịa
Chi dị nma, n'ị dị nma agam atụrụ Gị nma nma,
Ihe onyinye mara nma, ya kam ji buso nma kam ji bịa n'iru Gị
Onye onyinye Chukwu ọma; Chinecherem mo
VERSE 1
Chukwu gọziri mo Chukwu hụrụ m n'anya!
O n'echekwaba mo O n'echekwaba mo
Jaa, jaa ya nma k'anyị tuoro ya n'o meere iho ọma, ihe ukwu k'anyị tuoro ya
REFRAIN
Ọ gịnị kam j'asọngọngọ! ikele ya! bịa jaa ya nma nma
Onyinye buribu, Onyinye mara mma k'anyị jeenụ jaa ya nma Onye nwem, Chineke mo doo.
Chinecherem mo ghara eweniwe Efa elanụ
Chukwu mo doo, ọbụghị nchezoo O remem rikpom rikpom Obi emebem o
Onye nwem nara, Ọbụghị nchezoo doo, Ọbụghị nchezoo
VERSE 2
Ụfọdụ mmadụ nọ n'ụdị n'ime ụlọ ọgwụ n'ịmanya mmiri ma Chineke wepụrụ m ha
Jaa, jaa ya nma k'anyị tuoro ya n'o meerem iho ọma ihe ukwu k'anyị tuoro ya
VERSE 3
Ụfọdụ ndị pụrije Ude kerielanụ ha. Oh! Ụfọdụ ndị gara njem, nwanne Ọdịghị nke lọtara:
Jaa, jaa ya nma k'anyị tuoro ya n'o meerem iho ọma, ihe ukwu k'anyị tuoro ya
VERSE 4
Nsogbu m bụ na nne m wegh'ego, eg'ụwa o ne jugfe Nsogbu m bụ na nne m wegh'akụ, nwa nnem, agbaladim ọtọ
Jaa, jaa ya nma k'anyị tuoro ya n'o meerem iho ọma, ihe ukwu k'anyị tuoro ya