CHIMOBIM by Stanley Anih — Lyrics

Stanley Anih Igbo Offertory Hymns Motets Anthems Celebrations Solfa notation

Full Lyrics

Chukwu ebube Obinigwe, onye olu amara nara ekele. Chineke Nna nara otito. Mgbe ihe n'esiri m ike, ụmụnne m, Chim o Chimar'obimo. Ụmụnne m Chukwu lụọlụ m olu n'eju anya. Chukwu meere m ihe iju anya. Ewo Nna eh, Imela Chimar'obimo. Nna dalụ eh, Imela Chimar'obimo. I nye ekele, Nna dalụ eh, Imela Chimar'obimo. Chimar'obimo egwu ọma ka m ji nri bịa e nye gị otito. Nna dalụ eh, Imela Chimar'obimo. A ga m akpọrọ ndị enyi m bịa. A ga m akpọrọ ndị enyi m bịa. Nna dalụ eh, Imela. Chimar'obimo a ga m ịgba r'egwu aṅụrị wee bịa ekele Chineke m ememma. Ewo Nna dalụ eh, Imela Chimar'obimo. Imela Chineke Nna, Imela dalụ. Imela Chineke Nna, Imela dalụ. Imela dalụ, Imela dalụ, Nna dalụ eh, Imela. Chim ọma e, Chim obimo, I eyi n'ke ndụ m o. A ga m aja gị mma. Onye nwe m, olu ọma gị n'agba m anya. Onye nwe m, a ga m aja gị mma. Mmiri Chineke a ga m eji abụ ọma wee kọwa mmeso ọma gị n'achọ m. M o Chineke a ga m eji abụ ọma n'atinye ihe m too gị oge niile. Chim ọma e, a ga m eji ndụ m o fee gị. Otu ife ọma I me ndala m obi m o. Onye nwe m nara ekele, nara otito e. Nara ekele, nara otito, ewo Nna dalụ eh, Imela. Chimar'obimo ekele otito dị. Sị Nna ive bighie bi, ive mgbe ebhie bi.

Download the sheet music

CHIMOBIM

CHIMOBIM

By Stanley Anih
Solfa
Igbo
4 pages
1 Downloads
Offertory Hymns Motets Anthems Celebrations
0 0

More lyrics you may want