Chebem O, Nna by Harcourt Whyte — Lyrics

Harcourt Whyte Igbo Prayer Hymns Sacred songs Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Chebemo, Chebe nwa Gị, Chebemo. Chebe nwa Gị, Chebemo, Chebe nwa Gị, Chebemo. Nna, n'ụma ma na njọ, Nna, Chebe nwa Gị. VERSE 1 Miri nke ndụ na ezosi ike, ifufe nke ndụ na efe sike. Ebili miri n'ọ gbahara, juputara ebe nile n'ụwa. VERSE 2 Ekwensu dịka oke ọdụm, Nke n'agbọ uja nke iwe dị. Naejegharị na ebe dum, Na achọsike Onye Ọ gaelomi. VERSE 3 Ndị isi n'ụwa na ndị dike, Ndị akụ na ndị ma r'ihe. Ndịa naezipụta onwe ha, N'asụ ndị Ọ nọdụ ha digla. VERSE 4 Biko k'obim dị waka Gị, Kụziem buru nke eziri. K'am we soro ndụ nku Gị, Ebe udo na ọṅụ zur'oke dị.

Download the sheet music

Chebem O, Nna

Chebem O, Nna

By Harcourt Whyte
Solfa
Igbo
1 page
3 Downloads
Prayer Hymns Sacred songs
0 0

More lyrics you may want