Full Lyrics
CHORUS
Bia nu k'anyi kwere Dinwenu ukwe otito
Bianu k'anyi kwere Dinwenu ukwe otito
K'anyi kpo isi ala n'ihu Dinwenu O nyekere anyi
Maka n'o bu Dinwenu, maka n'o bu Dinwenu, o bu Chineke anyi
VERSE 1
Bia nu k'anyi kwere Onyenweanyi
K'anyi tisie mkpu ike tijere nkume nke nzoputa anyi
K'anyi bia n'ihu Ya nye Ya ekele
Were egwu onu na ukwe tobe Ya
VERSE 2
Bia nu k'anyi fee Onye nw'anyi kporo Ya isi ala
K'anyi sekpue n'ihu onye nw'anyi Onye kere anyi
N'ihi n'o bu Chineke anyi
Anyi nwa bu kwa ndi nke Ya
Igwe aturu o naazu
VERSE 3
Taa buru na unu anu olu Ya
Unu akpochila obi unu
Dika unu mere na Meriba ma Masa
N'ime ozara, mgbe Nna unu ha nwalere M
Ha nwalere M ma ha huru aka buru M