Full Lyrics
Bịa Mmụọ Nsọ, Osebụrụwa nke ife,
Si n'elu gwezidata ife Gị,
Ife Gị nke n'enwu enwu.
Bịa Nna ndị ogbenye, n'enye nkasi obi.
Bịa Onye bunye ife, ndị nile dị ndụ.
Bịa Onye nkasi obi kasị mma,
Ngị bunye ọbịa n'enye ndụ.
Ngị Onye n'enye ndụ.
Ngị bụ ezumike n'ekpomọkụ, Ngị bụ ndò.
N'amsogbu, Ngị bụ nkasi obi.
Ife dị anwụ anwụ, ife nwu dị ngọzi,
Chaba n'ime obi ndị niile kwelụ nụ.
Iwepụ Grasia Gị, onwerozi ife dị n'ime mmadụ dịzi ọcha.
Ife ọma dị n'ime ya apụla, ọ bụ mmehie.
Ife lụalụ.
Biko sachapụ ntụ njọ a.
Gbasụ mmiri n'obi kpọrọ nkụ, gwọọ ọrịa anyị ga.
Nye ume anị n'obi bụ ike, munye ọkụ n'obi jụrụ oyi.