Full Lyrics
[VERSE 1]
Bịa, Bịa Mmụọ Nsọ,
si n'eligwe zidata ife Gị,
ife Gị n'amuke amuke.
[SOPRANO]
Bịa O Nna ndị ogbenye,
wel' onyinye nke ntasi obi bịa,
Onye bi ife na dị n'ime dị ndụ.
[TENOR]
Ngị Onye ntasi obi ka sị mma,
Ngị b'Onye bịa n'eny'an̄ụrị n'obi,
Onye n'enyenwo ndụ.
[BASS]
N'ọlụ bụ ezumike,
n'ekpomọkụ Ngị bụ ndò,
na nsogbu Ngị bụ ntasi obi.
[SOPRANO & ALTO]
Ife dị anwụ anwụ,
Ife Mmụọ dị ngọzi,
chajue n'ime obi ndị n'ime kwelụnụ.
I wepụ Gratia Gị,
[VERSE 6]
Onwerọz' ife dị n'ime mmadụ dịzị ọcha,
ife ọma dị n'ime ya apụa,
O buluzia ife lubalu.
[BASS]
Biko sachapụ atụtụ njọ anyị,
gbasa mmiri n'obi kpọrọ nkụ,
gwọọ ọnya anyị ga.
[TENOR]
Tinye ume anị n'obi sili ike,
munye ọkụ n'obi jul' oyi,
duzie ndị n'eme njefie ụzọ.
[SOPRANO & ALTO]
Nye ndị kwelụnụ ndị chekwubelu na Gị,
ndị n'efe Gị,
Onyinye isaa Gị dị asọ.
[VERSE 10]
N'isi njedebe ny'anyị nzọpụta,
n'ụgwọ dịlị ezi omume,
nye anyị an̄ụrị ebebe.
Amen. Alleluia.