Full Lyrics
REFRAIN
Anyị abịawo Chineke, anyị abịawo Nna.
Anyị abịaw'ikele Gị, gozie anyị Chukwu.
VERSE 1
Bịanụ ụmụ Chineke k'anyị kelenụ Nna,
Bịanụ ndị kwere na Ọkpara Ya Jesu.
VERSE 2
Toonụ Chineke Onye kere ụwa nile,
Toonụ Chineke Onye n'echekwaba ya.
VERSE 3
Chukwu ebuka, ngọzi Ya karịrị akarị n'eb'anyị nọ.
Kele Ya, kele Ya, kelenụ Chukwu.
VERSE 4
Gị bụ Nna nwekel'anyị m'ụtụtụ m'ehihie,
Gị bụ Nna nwekel'anyị ma mgbede n'anyasị.