Full Lyrics
REFRAIN
Anyị abịawo Chineke,
Anyị abịawo Nna,
Anyị abịawo ikele Gị,
Gọzie anyị Chukwu.
VERSE 1
Bịanụ ụmụ Chineke,
K'anyị kelee nụ Nna,
Bịanụ ndị kwere na
Ọkpara ya Jesu.
VERSE 2
Toonụ Chineke
Onye kere ụwa nile,
Toonụ Chineke
Onye n'echekwaba ya.
VERSE 3
Chukwu ebuka,
Chukwu ebuka,
Ngozi ya karịrị aka,
Kelee ya, Kelee ya,
Kelee nụ Chukwu.
VERSE 4
Gị bụ Nna nwe kel' anyị
N'ụtụtụ n'ehihie,
Gị bụ Nna nwe kel' anyị
Ma mgbede ma anyasị.