Full Lyrics
CHORUS
Nw'ọhụrụ n'ebe!
Amụgo nw'ọhụrụ nye ụwa.
Nw'amara amụma ya n'agamuru ụwa abịago ụwa.
Mary mụrụ nwa kanwa, onye nzọpụta mmadụ.
Ih'anyi g'eji lee ya ọbịa bụ ekel'a kwụsị akwụsị.
VERSE 1
N'anyasị ahụ, mgbe ime mebere Mary
ya na Joseph a n'achọgharị ụlọ e b'o g'amụ nwa.
Emesịa h'ahụghị ụlọ
ha jebezia n'ụlọ anụ,
n'oge n'adịghị anya e were nụbazia akwa nwa.
VERSE 2
Onye nzọpụta mmadụ amụrụ n'ụlọ anụ,
onye d'ike dị egwu dịkw'umeala dị egwu.
Isaiah mara amụma were sị o;
na nzọpụta ụw'a dịgọ nso.
K'ụwa nụrịb'o k'ọnụ na nzọpụta ya abịarụgọ.
VERSE 3
Chukwu ker'ụwa ekele o,
eke ker'ụwa otito
anyị asọpụrụ gị nna n'onyinyo m'inyer'anyị.
Chukwu ker'ụwa ekele o,
eke ker'ụwa otito
anyị asọpụrụ gị nna n'onyinyo m'inyer'anyị.