Full Lyrics
REFRAIN
Ngwanụ k'anyị jeenụ kelee Nwa Chineke
Emmanuel, Ez'udo Onye dị mma
Ọ bụ ya naazọpụta, Kristi abiago
Mgbọrọgwụ Devidi, Nmejupụta nkwa nke nzọpụta mmadụ! Kristi abiago
Anyị naañụrị, Kristi Nwa Chineke, Ez'amụrụ ọhụrụ
VERSE 1
Mgbe Josef na Meri rutelu Bethlehem
N'ime abalị mgb'ime n'eme nwunye ya
Ọ wee gbagharịba chọgharịba ebe ọ g'amụ nwa
Kpom kpom n'ebe a! Ha jụọ ya Onye n'akụ?
Ọ zaa Ọ bụ m o! Ime n'eme nwunye m!
Ha sị ya, mechie kene r'anyụzọ jeke n'ebọzọ
N'oyi n'atụ efe adịghị ya chachaa!
VERSE 2
Na mgbaghwoju anya Josef wee letipu anya
Ọ hụ n'ebe ahụ ụlọ arụrụ maka ụmụ anụ
Meri wee bee, ọ nọ n'ude ihe mgbu ọmụmụ nwa
Josef wer'ọsọ n'ije gbagaba rue n'ụlọ anụ
Ọ kwadoro Meri eb'ọmụmụ nwa
Wer'ahịhịa wee chọọ ya nma! Ọ kụdata nwunye ya
An'ekwu ka n'ekwu Meri amụọ!
VERSE 3
Ebube Chukwu wee ju n'igwe
Amamihe mmadụ bụzị nkịtị
Ị mana Chukwu Nwa abụrụgo mmadụ n'ihi anyị
Ọ lu ifunanya, Ọ lu itunanya
Ọ bụ ihomimi n'ezie
Ọ lu ebube, ndị mmụọ ozi were mep'ọnụ
Were kweb'ukwe k'ana nwunyanya!
Otito dịrị Chukwu n'elu kach'elu
N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ ndị nwere obi ọma