Full Lyrics
CHORUS
Aja nke elu Obe n'aja nke Altar b'otu ihe
Maka n'ọ bụ Kristi n'Onwe Ya
bụ Onye nchụaja bụzụkwa ih'e ji achụ ya
REFRAIN I
N'elu Obe Ọ n'agba mmee
Man'ugbu a n'altar dị ngọzi site n'igb'uko nd'ụkọchukwu
REFRAIN II
Ọ naghị agbazi mmee
VERSE 1
N'oriri Ikpeazụ ka Kristi dobere
Eucharistia dị asọ
Na Ya ka Ọ nyere Iwu a
"Mebe nụ nke a na ncheta nke m o"
VERSE 2
Leenụ Onyenweanyị ka Ọ nọ n'altar
Ụkọchukwu ezie
Anyị kwenyere n'ezie na Ọ bụ ụzọ nzọpụt'anyị
VERSE 3
K'anyị sonye Kristi n'aja nke Missa
Ọ bụ aja kachasị nsọ
N'ihi n'Ọ bụ Ụzọ anyị g'esi zute Nna n'enigwe
VERSE 4
Leenụ Chukwu Nwa ka Ọ si gbasa aka Ya n'obe
Oh Ọ n'asị ndị njọ bịa naranụ ndụ olepu
VERSE 4B (SOLO CHANT)
Ih'omimi dị nsọ dị elu dị n'igb'uko nd'ụkọchukwu
Achịcha na mmanya k'an'erugharị n'oge ọdịdọ nsọ
site n'ak'ụkọchukwu Onye nọchiri anya Dinwenu anyị
n'ichunyere Chukwu aja dị okpu
nk'anaghị agbazi mme
Ọ naghị agbazi mmee
Ọ naghị agbazim mee