Full Lyrics
REFRAIN
Aja dị nsọ, Aja dị okè n'ụkụmụ Chineke n'achụnụ Chukwu.
Aja nyi n'a chụnụ Chukwu b'onwe anyi,
Ahụ na mkpụr'obi anyi,
Nara, Nna, nara, Nar'onyinye ụmụ Gị nara aja dị nsọ.
VERSE 1
Anyi ekele Gị mak'ọgọ Gị nile Chukwu biko nar'aja nara ụmụ Gị gozie.
Anyi ekele Gị maka afọma Gị Anyi ekele Gị Nna maka ngọzi Gị
VERSE 2
Anyi enye Gị nsọpụrụ na otito kach'elu Anyi edó Gị ebube Nna, Onye kach'elu
Anyi ebunye Gị iko nsọ, biko nara ya.
VERSE 3
Anyi arịọ Gị mgbaghara njọ anyi Anyi arịọ Gị ebere n'ọbọdọ anyi
Anyi arịọ Gị gratia na ngọzi nile.