AHỤHỤ JESU… by Chibi — Lyrics

Chibi Igbo Holy Week Hymns Lenten Hymns Sacred songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Ka Jesu nọ na ekpere n'ogige Getsemanị, Ọ hụrụ ahụhụ niile ọ gaata. Ahụhụ mmụọ, n'ọsịsọ mme, ahụhụ, ahụhụ e rika. A hụhụ O! A hụhụ b'ị k'ọ gaa ñụọ maka nzọpụta anyị. O kpebere ekpere, tie Abba Nna, bupurum ya, bupurum iko nke a kam ghar'ị ñụọ ya bupurum ya, ya b'uche mo. Mana maka nzọpụta anyị, O kpeziere si Nna, uche Gị mee. Ahụhụ Ya wee bidozie. Ahụhụ, ahụhụ Jesu akarịa, leenu, ahụhụ Ya e rika, orika, rika. Chi mo! rika. [VERSE 1] Judas rere Ya, Pịta gọnarịa Ya, ndị ọzọ gbar'ọsọ, ọ kwa ndị ụm'azụ Ya. Chaị! [VERSE 2] Ndị agha buru ngburu bịa jide Jesu kpụgharịba Ya ka nwa atụrụ nga bịga. Chaị! [VERSE 3] Ha boro Ya ebubo, dọka Yaa kwa Ya, gbụọ Yaa sọ, [VERSE 4] Ha kpubere Y'okpogwu, nye Ya nkpọrọ, kparịcha Ya, wee bur'obe boo nwa Chukwu. Chaị! [VERSE 5] Obe Ya karịrị Ya, ume n'ekupu Ya, ma Ọ daa n'okpur'obe, ndị agha hụaa pịawa Y'ihe. Chaị! [VERSE 6] Ka ha ruru n'elu ugwu, ha agba nwa Chukwu ọtọ, tọgbọ Ya n'elob'ahụ, were nnukwu ntụigwe kpọgbụọ Ya. Chaị! [VERSE 7] Ndị mmadụ n'ele Ya, ndị jịik'ọchịchị n'akọcha Ya, ndị agha jị Ya akp'ọchị, ngwanụ, sị n'el'obe rịdata. Chaị! [VERSE 8] Ọkw'Ị bụ Mezaya, ngwa, zọpụt'onwe Gị, zọpụta nụ any'o, onye ohị nagwa nwa Chukw'okwu. Chaị! [VERSE 9] Eloi, Eloi, lama sabachthani, haa chịa, k'anyị maara m'Elija ọ gaa zọpụta Ya. Chaị! [VERSE 10] Jesu nọ n'obe tie, akpịrị n'akpọm nkụ, h'ewere mmanya gbarụ ụka detu Ya n'ọnụ. Chaị! [VERSE 11] N'aka Gị Nna kam tinyere Mmụọ M, Ọ nwụọ, h'ekwubezie nwoke a bụkwa nwa Chukwu. Chaị! [VERSE 12] Mgb'anyị chere n'ọgwụsịgo, n'ịhị n'Ọ nwụọla, onye agha wee bịa wer'ube mapụoa kụkụ Ya. Chaị!

Download the sheet music

AHỤHỤ JESU…

AHỤHỤ JESU…

By Chibi
Solfa
Igbo
2 pages
0 Downloads
Holy Week Hymns Lenten Hymns Sacred songs Hymns
0 0

More lyrics you may want