Full Lyrics
REFRAIN
Aga m ebili lachigh'azụ, lakwuru Nna m o!
Eh! Aga m ahapụ ebea jọrọ njọ, ebe rer'ure, lakwuru Nna m.
VERSE 1
Ezi Nna biko, emehiela m Gị, megid'eligwe, megidekwa Gị.
VERSE 2
Etosigh m ka akpọkwa m nwa Gị, ana m'arịọ Gị, gụnye m n'ụmụ odibo Gị.
VERSE 3
Amaara m njọ m nile, ha doro m anya. Ihe ndị bụ arụ n'iru Gị, Chineke, bụ m mere ha.
VERSE 4
Lekwasị m anya ebere, Onyenw'anyị, gbaghara, ezi Chineke, njọ m nile.
VERSE 5
Ezi anụrị bụ nke onye Chukwu gbaghaara njọ Ya, ony'ehichapụrụ njọ ya nile.
VERSE 6
Ị bụ enyemaka m, ike m na mgbodo m, Ị bụ anụrị m, Dinwenu.