Full Lyrics
CHORUS
Chukwu lee m na be Gị o,
abịaram inye Gị ekele ma
nara ngọzi.
VERSE 1
Ekele ọma ka m g'enye
n'im'ụlọ nsọ Chukwu,
otit'ọma ka m g'enye Gị
maka n'ọ bụ Gị ker'anye.
VERSE 2
Batanụ k'anyị kpọ isiala nye Ya
maka n'Ọ na emere anyị mma,
k'anyị gbuo ikpere n'ihu Ya
wete nar'amara Ya kelenụ Ya.
VERSE 3
Makedụ onye nwer'ike ịbịa
were nat'amara n'ihu Chukwu,
ọ bụ onye dị umeala
na onye nwer'obi ọcha.